4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum;+ n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.+
14 A ga-eme ka i guzosie ike n’ezi omume.+ Ị ga-anọ mmegbu n’ebe dị anya+—n’ihi na ọ dịghị nke ị ga-atụ egwu—ị ga-anọkwa ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’ebe dị anya, n’ihi na ọ gaghị erute gị nso.+
8 M ga-abụrụ ụlọ m onye nche,+ ka ọ ghara inwe onye ga-esi na ya gafere, ka ọ gharakwa inwe onye ga-abataghachi na ya; onyeisi ọrụ agakwaghị esi n’etiti ha gafere,+ n’ihi na ejiriwo m anya m hụ ya ugbu a.+