4 M ga-enye ha ndị ọzụzụ atụrụ ga na-azụ ha dị ka atụrụ;+ ha agaghịkwa atụ egwu ọzọ, ụjọ ọ bụla agaghịkwa atụ ha,+ ọ dịghịkwa nke ga-efu efu n’ime ha,” ka Jehova kwuru.
13 Ma ndị fọdụrụ n’Izrel+ agaghị eme ajọ omume,+ ha agaghịkwa agha ụgha,+ ha agaghịkwa enwe ire aghụghọ;+ n’ihi na ha onwe ha ga-eriju afọ ma dinara ala,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”+