15 Mgbe ha risịrị nri ụtụtụ, Jizọs sịrị Saịmọn Pita: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?”+ O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.”+ Ọ sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”+
28 Na-elezinụ+ onwe unu+ na ìgwè atụrụ+ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya,+ ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ,+ nke o ji ọbara+ Ọkpara ya zụta.
2 Na-azụnụ+ ìgwè atụrụ Chineke+ nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha;+ ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya,+ kama n’ịnụ ọkụ n’obi;