28 Na-elezinụ+ onwe unu+ na ìgwè atụrụ+ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya,+ ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ,+ nke o ji ọbara+ Ọkpara ya zụta.
2 Na-azụnụ+ ìgwè atụrụ Chineke+ nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha;+ ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya,+ kama n’ịnụ ọkụ n’obi;