22 N’ihi na ọ bụ ezie na ndị gị, gị Izrel, ga-adị ka ájá nke oké osimiri,+ naanị ndị fọdụrụ n’etiti ha ga-alọta.+ Mkpochapụ+ e kpebiworo ga na-asọ dị ka idei mmiri n’ezi omume,+
7 M ga-emekwa ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+ meekwa ka ndị ahụ a chịgara n’ebe dị anya bụrụ mba dị ike;+ Jehova ga-achịkwa ha dị ka eze n’Ugwu Zayọn, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+