12 “‘M ga-achịkọta Jekọb, unu dum;+ aghaghị m ịchịkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ, dị ka ìgwè anụ nke nọ n’ebe ha na-ata ahịhịa;+ a ga-eme mkpọtụ na ha n’ihi ndị mmadụ.’+
18 Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+