28 Ha agaghị abụkwa ihe mba dị iche iche ga-achịkọrọ n’ike.+ Anụ ọhịa nke ụwa agaghị eripịa ha. Ha ga-ebikwa n’obi iru ala. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji;+ n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.+
17 n’ihi na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye nọ n’etiti ocheeze ahụ, ga-azụ ha dị ka atụrụ,+ ọ ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri+ nke ndụ. Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha.”+