5 Oge nzọcha mkpụrụ unu ga-adịgide ruo n’oge ịghọ mkpụrụ vaịn, oge ịghọ mkpụrụ vaịn unu ga-adịgide ruo n’oge ịgha mkpụrụ; unu ga-erikwa nri unu rijuo afọ+ wee biri n’ala unu n’obi iru ala.+
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji;+ n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.+