6 M ga-eme ka udo dị n’ala unu,+ unu ga-edinakwa ala n’enweghị onye ga-eme ka unu maa jijiji;+ m ga-eme ka a ghara inwekwa ajọ anụ ọhịa n’ala unu,+ mma agha agaghịkwa agabiga n’ala unu.+
6 Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọ,+ agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm tojuru etoju+ na anụ mara abụba ga-anọkọkwa;+ nwatakịrị ga na-edukwa ha.
9 Ọ dịghị ọdụm ga-anọ n’ebe ahụ, ụdị anụ ọhịa ọ bụla nke na-adọgbu adọgbu agaghị abata na ya.+ Ọ dịghị nke a ga-ahụ n’ebe ahụ;+ ọ bụ ndị a gbatara agbata ga na-eje ije n’ebe ahụ.+
25 “Anụ ọhịa wolf+ na nwa atụrụ ga-atakọ nri,+ ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi;+ ọ bụ ájá ga-abụ nri agwọ.+ Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum,”+ ka Jehova kwuru.
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+