4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
9 Ndị bi n’obodo niile nke Izrel ga-aga suo ihe agha na ọta nta na ọta ukwu ọkụ, were ha mere nkụ,—ha na ụta na akụ́ na okpiri nwere isi ígwè na ube; ha ga-eji ha mere nkụ+ ruo afọ asaa.
10 M ga-ebipụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem, bipụkwa ịnyịnya na Jeruselem.+ A ga-ebibikwa ụta agha.+ Ọ ga-agwa mba dị iche iche okwu udo;+ ọchịchị ya ga-esi n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, sikwa n’osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa.+