6 Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọ,+ agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm tojuru etoju+ na anụ mara abụba ga-anọkọkwa;+ nwatakịrị ga na-edukwa ha.
25 “Anụ ọhịa wolf+ na nwa atụrụ ga-atakọ nri,+ ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi;+ ọ bụ ájá ga-abụ nri agwọ.+ Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum,”+ ka Jehova kwuru.
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+