4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum;+ n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.+