11 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-esetị aka ya ọzọ, nke ugboro abụọ,+ inweta ndị fọdụrụ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ site n’Asiria+ na Ijipt+ na Patrọs+ na Kush+ na Ilam+ na Shaịna+ na Hemat nakwa agwaetiti nke oké osimiri.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+