31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi.
16 A ga-enwekwa okporo ụzọ+ ga-esi n’Asiria pụta maka ndị fọdụrụ+ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ,+ dị nnọọ ka e nwere maka Izrel n’ụbọchị o si n’ala Ijipt pụta.
8 kama ha ga-asị, ‘Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile m chụsasịrị mkpụrụ nke ụlọ Izrel kpọpụta ha wee kpọlata ha,’ ha ga-ebikwa n’ala nke ha.”+
17 “Ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu, m ga-enyekwa unu ala Izrel.+