12 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-akụtusị mkpụrụ dị na ya,+ malite na mmiri na-asọ asọ nke Osimiri Yufretis+ ruo na ndagwurugwu Ijipt,+ a ga-atụtụtakwa unu otu otu,+ unu ụmụ Izrel.
13 M ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta ha,+ sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha wee kpọbata ha n’ala ha,+ zụọkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, n’akụkụ ọwa mmiri nakwa n’ebe obibi niile nke ala ha.+
20 N’oge ahụ, m ga-akpọbata unu, ọbụna n’oge m ga-achịkọta unu. N’ihi na m ga-eme ka unu nwee aha na otuto n’etiti ndị niile nọ n’ụwa, mgbe m ga-achịkọtaghachi ndị unu a dọọrọ n’agha n’ihu unu,” ka Jehova kwuru.+