13 M ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta ha,+ sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha wee kpọbata ha n’ala ha,+ zụọkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, n’akụkụ ọwa mmiri nakwa n’ebe obibi niile nke ala ha.+
21 “Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-akpọpụta ụmụ Izrel n’etiti mba dị iche iche ha gara. M ga-esikwa ebe niile kpọkọta ha wee kpọlata ha n’ala ha.+
11 A ga-achịkọta ụmụ Juda na ụmụ Izrel ka ha dịrị n’otu,+ ha ga-eme otu onye onyeisi ha wee si n’ala ahụ pụọ,+ n’ihi na ụbọchị Jezril ga-abụ ụbọchị ukwu.+