13 M ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta ha,+ sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha wee kpọbata ha n’ala ha,+ zụọkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, n’akụkụ ọwa mmiri nakwa n’ebe obibi niile nke ala ha.+
14 N’ebe ịta nri dị mma ka m ga-azụ ha, ọ bụkwa n’ugwu ndị dị elu n’Izrel ka ebe obibi ha ga-adị.+ N’ebe ahụ ka ha ga-amakpuru n’ebe obibi dị mma,+ n’ebe ịta nri nke jupụtara n’ahịhịa ka ha ga na-ata nri n’ugwu ndị dị n’Izrel.”
12 “‘M ga-achịkọta Jekọb, unu dum;+ aghaghị m ịchịkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ, dị ka ìgwè anụ nke nọ n’ebe ha na-ata ahịhịa;+ a ga-eme mkpọtụ na ha n’ihi ndị mmadụ.’+