11 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-esetị aka ya ọzọ, nke ugboro abụọ,+ inweta ndị fọdụrụ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ site n’Asiria+ na Ijipt+ na Patrọs+ na Kush+ na Ilam+ na Shaịna+ na Hemat nakwa agwaetiti nke oké osimiri.+
10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn;+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ, iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+
14 M ga-ekwe ka unu chọta m,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọkọta ndị unu a dọọrọ n’agha, sikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+
8 Lee, m ga-esi n’ala dị n’ebe ugwu kpọlata ha,+ m ga-esikwa n’ime ime ụwa kpọkọta ha.+ Ma onye ìsì ma onye ngwọrọ ma nwaanyị dị ime ma nwaanyị ime na-eme ga-eso ha.+ Ha ga-alọta ebe a dị ka ọgbakọ dị ukwuu.+