9 Mgbe unu laghachikwutere m,+ debekwa ihe niile m nyere n’iwu+ ma mee ha,+ ọ bụrụgodị na ndị unu a chụsasịrị achụsasị nọ na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ chịkọta+ ha, kpọlatakwa ha+ n’ebe ahụ m họọrọ ime ka aha m biri na ya.’+
14 “Lọghachinụ, unu ụmụ na-enupụ isi,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na mụ onwe m bụ di nwe unu;+ m ga-akpọrọ unu, otu onye n’otu obodo, kpọrọkwa mmadụ abụọ n’otu ezinụlọ, wee kpọta unu na Zayọn.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+
4 “Ònye n’ime unu nke nwere otu narị atụrụ, ka ọ ga-abụ, ọ bụrụ na otu n’ime ha efuo, ya aghara ịhapụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa gaa chọwa nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya?+