17 “Iwe were m n’ihi otú uru na-ezighị ezi ọ na-enweta si dị njọ.+ M wee tie ya ihe otiti, wepụ ihu m,+ mgbe iwe na-ewe m. Ma, ọ bụ onye nnupụisi+ nke na-eje ije n’ụzọ obi ya gwara ya.
22 N’ihi na ndị m dị nzuzu.+ Ha amaghị m.+ Ha bụ ụmụ na-amaghị ihe; ha abụghị ndị nwere nghọta.+ Ha bụ ndị maara ihe n’ime ihe ọjọọ, ma n’ime ihe ọma, ha bụ ndị na-amaghị ihe.+