5 “N’ihi na Onye Ukwu nke kere gị+ bụ di nwe gị,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya;+ Onye Nsọ Izrel bụkwa Onye Mgbapụta gị.+ A ga-akpọ ya Chineke nke ụwa dum.+
2 “Gaa jiri oké olu gwa Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Echetara m nke ọma obiọma* i nwere n’oge ị bụ nwa agbọghọ+ na ịhụnanya i nwere n’oge m kwere nkwa ịlụ gị,+ na otú i si na-eso m n’ala ịkpa, n’ala a na-aghaghị mkpụrụ ọ bụla.+
32 ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’ala Ijipt kpọpụta ha,+ ‘bụ́ ọgbụgba ndụ m nke ha onwe ha mebiri,+ ọ bụ ezie na m bụ di nwe+ ha,’ ka Jehova kwuru.”