23 N’ụbọchị ahụ, a ga-enwe okporo ụzọ+ nke ga-esi n’Ijipt gaa Asiria. Asiria ga-abata n’Ijipt, Ijipt abatakwa n’Asiria. Ha ga na-ejekọ ozi, ya bụ, Ijipt na Asiria.
3 Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa,+ sị: “Wepụnụ ihe nọchiri n’ụzọ Jehova!+ Meenụ ka okporo ụzọ Chineke anyị, bụ́ nke gafere na mbara ọzara, kwụrụ ọtọ.+
10 Pụọnụ, sinụ n’ọnụ ụzọ ámá pụọ. Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ.+ Wụọnụ ájá n’ụzọ, wụọnụ ájá n’okporo ụzọ. Wepụsịanụ nkume dị na ya.+ Gwunyerenụ ndị dị iche iche ihe mgbaàmà.+