3 Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, ma wughachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel—ọ bụ ya bụ ezi Chineke+—bụ́ ụlọ dị na Jeruselem.+
3 Unu niile ndị bi n’elu ala+ na unu ndị bi n’ụwa, unu ga-ahụ ihe yiri mgbe a na-egwunye ihe mgbaàmà n’elu ugwu,+ unu ga-anụkwa ụda nke na-ada ka mgbe a na-afụ opi.+
22 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! M ga-eweliri mba dị iche iche aka m,+ m ga-ewelikwara ndị dị iche iche ihe mgbaàmà m.+ Ha ga-ekuru ụmụ gị ndị ikom n’obi bịa, ha ga-ebukwa ụmụ gị ndị inyom n’ubu ha.+