8 Okporo ụzọ ga-adị n’ebe ahụ,+ ee, ụzọ ga-adị; a ga na-akpọ ya Ụzọ nke Ịdị Nsọ.+ Onye na-adịghị ọcha agaghị esi na ya gafee.+ Ọ ga-abụ maka onye na-eje ije n’ụzọ ahụ, ọ dịghịkwa ndị nzuzu ga-awagharị na ya.
3 Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa,+ sị: “Wepụnụ ihe nọchiri n’ụzọ Jehova!+ Meenụ ka okporo ụzọ Chineke anyị, bụ́ nke gafere na mbara ọzara, kwụrụ ọtọ.+
10 Pụọnụ, sinụ n’ọnụ ụzọ ámá pụọ. Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ.+ Wụọnụ ájá n’ụzọ, wụọnụ ájá n’okporo ụzọ. Wepụsịanụ nkume dị na ya.+ Gwunyerenụ ndị dị iche iche ihe mgbaàmà.+