Aịzaya
19 Okwu e kwuru megide Ijipt:+ Lee! Jehova nọ n’elu ígwé ojii+ nke ji ọsọ na-abata n’Ijipt. Chi na-abaghị uru nke Ijipt ga-ama jijiji n’ihi ya,+ obi ga-alọkwa ndị Ijipt mmiri n’obodo ha.+
2 “M ga-akpali ndị Ijipt ka ha buso ndị Ijipt agha. Onye ọ bụla ga-ebuso nwanne ya agha. Onye ọ bụla ga-ebuso enyi ya agha, obodo ga-ebuso obodo agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze agha.+ 3 A ga-akpaghasị mmụọ nke ndị Ijipt n’obodo ha,+ m ga-akụghasịkwa atụmatụ ha.+ Ha ga-agakwuru chi ndị na-abaghị uru+ na ndị anwansi na ndị na-agba afa na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu.+ 4 M ga-enyefe Ijipt n’aka nna ukwu dị obi ọjọọ, eze nke ga-achị ha ga-adịkwa ike,”+ ka ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru.
5 Mmiri ga-atacha n’oké osimiri, osimiri ga-atakwa wee kpọọ nkụ.+ 6 Osimiri ga na-esi ísì; ọwa mmiri niile nke Naịl Ijipt ga-atalata wee kpọọ nkụ.+ Ahịhịa amị+ na achara ga-erekasị. 7 Ebe dị iche iche mmiri na-adịghị n’akụkụ Osimiri Naịl, n’ọnụ Osimiri Naịl, tinyere ala dum a kụrụ mkpụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl, ga-akpọ nkụ.+ Ifufe ga-efesasị ihe a kụrụ na ha, ha agaghị adịkwa. 8 Ndị ọkụ azụ̀ ga-eru uju, ndị niile na-atụnye nko azụ̀ n’Osimiri Naịl ga-eru uju, ike ga-agwụkwa ọbụna ndị na-agbasa ụgbụ azụ̀ n’elu mmiri.+ 9 Ihere ga-eme ndị na-eji ogho e tiri eti+ arụ ọrụ; ihere ga-emekwa ndị na-ekwe ákwà ọcha. 10 A ga-egbu mmụọ nke ndị ya na-akpa ákwà,+ mkpụrụ obi nke ndị niile na-arụ ọrụ ego ga-anọkwa ná mwute.
11 Ndị isi Zoan+ dị nnọọ nzuzu. Ndụmọdụ nke ndị maara ihe n’etiti ndị ndụmọdụ Fero bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.+ Olee otú unu ga-esi asị Fero: “Abụ m nwa ndị maara ihe, nwa ndị eze oge ochie”? 12 Oleezi ebe ha nọ—bụ́ ndị amamihe gị+—ka ha kọọrọ gị, ka ha marakwa ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri banyere Ijipt?+ 13 Ndị isi Zoan ezuzuwo nzuzu,+ a ghọgbuwo ndị isi Nọf,+ ndị isi+ nke ebo ya niile emewokwa ka Ijipt na-awagharị awagharị. 14 Jehova etinyewo mmụọ nke mgbagwoju anya n’ime ya.+ Ha emewokwa ka Ijipt na-awagharị n’ọrụ ya niile, dị nnọọ ka onye mmanya na-egbu si atụrụgharị n’agbọ ọ gbọrọ.+ 15 Ijipt agaghị enwe ọrụ ọ bụla nke isi ma ọ bụ ọdụdụ, alaka ma ọ bụ ahịhịa amị, pụrụ ịrụ.+
16 N’ụbọchị ahụ, Ijipt ga-adị ka ụmụ nwaanyị, ọ ga-ama jijiji,+ nọrọkwa n’ụjọ n’ihi aka nke Jehova nke ụsụụ ndị agha na-atụ ya.+ 17 Ala Juda ga-aghọkwara Ijipt ihe na-akpata nṅagharị.+ Ụjọ ga-ejide onye ọ bụla a kọọrọ ya n’ihi ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime ya.+
18 N’ụbọchị ahụ, a ga-enwe obodo ise ndị ga na-asụ asụsụ Kenan+ n’ala Ijipt,+ na-aṅụkwara Jehova nke ụsụụ ndị agha iyi.+ A ga na-akpọ otu n’ime ha Obodo Ntida.
19 N’ụbọchị ahụ, a ga-enwe ebe ịchụàjà a rụụrụ Jehova n’etiti ala Ijipt,+ nweekwa ogidi a rụụrụ Jehova n’akụkụ ókèala ya. 20 Ọ ga-abụkwara Jehova nke ụsụụ ndị agha ihe ịrịba ama na ihe akaebe n’ala Ijipt;+ n’ihi na ha ga-etiku Jehova n’ihi ndị na-emegbu ha.+ Ọ ga-ezigakwara ha onye nzọpụta, bụ́ onye ukwu, onye ga-anapụta ha.+ 21 Jehova ga-emekwa ka ndị Ijipt mara ya.+ Ndị Ijipt ga-amarakwa Jehova n’ụbọchị ahụ, ha ga-achụrụ ya àjà, nyekwa ya onyinye,+ ha ga-ekwe Jehova nkwa, mezuokwa ya.+ 22 Jehova ga-etikwa Ijipt ihe otiti.+ A ga-eti ha ihe otiti, gwọọkwa ha.+ Ha ga-alọghachikwute Jehova.+ Ọ ga-anabata arịrịọ ha, gwọọkwa ha.+
23 N’ụbọchị ahụ, a ga-enwe okporo ụzọ+ nke ga-esi n’Ijipt gaa Asiria. Asiria ga-abata n’Ijipt, Ijipt abatakwa n’Asiria. Ha ga na-ejekọ ozi, ya bụ, Ijipt na Asiria. 24 N’ụbọchị ahụ, Izrel ga-emezu Ijipt na Asiria atọ,+ wee bụrụ ngọzi n’etiti ụwa,+ 25 n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-agọziworị ha,+ sị: “Ka ndị m Ijipt na ọrụ aka m Asiria+ na ihe nketa m Izrel+ bụrụ ndị a gọziri agọzi.”