14 “Kọọnụ ya n’Ijipt, kwusaanụ ya na Migdọl,+ kwusaakwanụ ya na Nọf+ nakwa na Tapanhis.+ Sịnụ, ‘Guzoro, jikere,+ n’ihi na mma agha ga-eripịa gị gburugburu.+
13 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-ebibikwa arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ bibiekwa chi dị iche iche na-abaghị uru ndị dị na Nọf.+ A gakwaghị enwe onyeisi n’ala Ijipt; m ga-emekwa ka ụjọ dịrị n’ala Ijipt.+
6 N’ihi na, lee! ha ga-ala n’ihi na e bibiwo ya.+ Ijipt ga-achịkọta ha ọnụ;+ Memfis+ ga-eli ha. Ahịhịa akụwa ga-eweghara ihe ha+ a na-achọsi ike, bụ́ ndị e ji ọlaọcha mee; ọhịa ogwu ga-ejupụta n’ụlọikwuu ha.+