12 M ga-amụnye ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ;+ ọ ga-agba ha ọkụ ma buru ha laa, ọ ga-eyiri ala Ijipt, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eyiri uwe mwụda ya,+ ọ ga-esikwa na ya laa n’udo.
2 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-ebipụ aha arụsị niile n’ala ha,+ a gaghịkwa echeta ha ọzọ; m ga-emekwa ka ndị amụma+ na ike ndị mmụọ ọjọọ si n’ala a pụọ.+