12 M ga-agabiga n’ala Ijipt n’abalị+ a wee gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ;+ m ga-emekwa ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ chi niile nke Ijipt.+ Abụ m Jehova.+
25 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Lee, m ga-elebara Emọn+ nke obodo Noo+ anya, lebakwara Fero na Ijipt na chi ya dị iche iche+ na ndị eze ya,+ ọbụna Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi.’+