12 M ga-agabiga n’ala Ijipt n’abalị+ a wee gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ;+ m ga-emekwa ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ chi niile nke Ijipt.+ Abụ m Jehova.+
12 M ga-amụnye ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ;+ ọ ga-agba ha ọkụ ma buru ha laa, ọ ga-eyiri ala Ijipt, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eyiri uwe mwụda ya,+ ọ ga-esikwa na ya laa n’udo.
25 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Lee, m ga-elebara Emọn+ nke obodo Noo+ anya, lebakwara Fero na Ijipt na chi ya dị iche iche+ na ndị eze ya,+ ọbụna Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi.’+
13 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-ebibikwa arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ bibiekwa chi dị iche iche na-abaghị uru ndị dị na Nọf.+ A gakwaghị enwe onyeisi n’ala Ijipt; m ga-emekwa ka ụjọ dịrị n’ala Ijipt.+