23 ‘M ga-edokwa aha ukwu m nsọ,+ nke a nọ na-emetọ n’etiti mba dị iche iche, nke unu metọrọ n’etiti ha; mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mgbe e doro m nsọ n’etiti unu n’ihu ha.+
16 Ị ga-abịakwa ibuso ndị m Izrel agha, ka i kpuchie ala ha dị ka ígwé ojii.+ N’oge ikpeazụ ka ọ ga-eme. M ga-eme ka ị bịakwasị ala m,+ ka mba niile wee mara m mgbe m doro onwe m nsọ n’ebe ị nọ, n’ihu ha, gị Gọg.”’+