5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+
2 n’ihi na ikpe ya bụ eziokwu, bụrụkwa ihe ziri ezi.+ N’ihi na o mezuwo ihe e kpere n’ikpe n’isi oké nwaanyị akwụna ahụ, bụ́ onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa, ọ bọwokwa ọbọ ọbara ndị ohu ya n’ahụ́ nwaanyị ahụ.”+