4 Ya mere, m ga-ekwe n’ezie ka obi Fero kpọchie,+ ọ ga-achụwakwa ha, m ga-enwetara onwe m otuto site n’imeri Fero na ìgwè ndị agha ya niile;+ ndị Ijipt ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova.”+ Ha wee mee nnọọ otú ahụ.
23 ‘M ga-edokwa aha ukwu m nsọ,+ nke a nọ na-emetọ n’etiti mba dị iche iche, nke unu metọrọ n’etiti ha; mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mgbe e doro m nsọ n’etiti unu n’ihu ha.+