10 N’ihi na anyị anụwo otú Jehova si mee ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọọ n’ihu unu mgbe unu si n’Ijipt pụta,+ nụkwa ihe unu mere eze abụọ nke ndị Amọraịt bụ́ ndị nọ n’ofe Jọdan, ya bụ, Saịhọn+ na Ọg,+ bụ́ ndị unu lara n’iyi.+
11 I kewakwara+ oké osimiri n’ihu ha, ha wee jee ije n’ala akọrọ mgbe ha si n’etiti oké osimiri ahụ gafee;+ ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’oké osimiri+ dị ka nkume+ a tụbara na mmiri dị ike.+