15 kama a ga-asị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile ọ chụsasịrị ha kpọpụta ha!” m ga-akpọlata ha n’ala ha, nke m nyere ndị nna nna ha.’+
28 “‘Ha ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha, mgbe m mere ka a dọrọ ha n’agha laa ná mba dị iche iche, kpọkọtakwa ha n’ala ha,+ ka m wee ghara ikwe ka otu n’ime ha fọdụ n’ebe ahụ ọzọ.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+