18 N’oge ahụ, ụlọ Juda na ụlọ Izrel+ ga-ejekọ+ ije, ha niile ga-esoro si n’ala dị n’ebe ugwu pụta wee banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+
6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+
3 N’ihi na, “lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-achịkọta ndị m a dọọrọ n’agha, bụ́ Izrel na Juda,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-akpọlata ha n’ala m nyere ndị nna nna ha, ha ga-ebirighachi na ya.”’”+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+