Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi Mehalat.+ Maskil. Abụ ọma Devid.
53 Onye nzuzu asịwo n’obi ya:
“Jehova adịghị.”+
Ha emewo omume na-eweta mbibi, meekwa arụ n’ajọ omume ha mere;+
Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+
2 Ma Chineke si n’eluigwe ledata anya lee ụmụ mmadụ,+
Iji hụ ma ọ̀ dị onye nwere nghọta, onye na-achọ Jehova.+
4 Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ,+
Bụ́ ndị na-eri ndị m dị ka à ga-asị na ha bụ nri?+
Ha adịghị akpọku Jehova.+