15 Mgbe ahụ, ndị niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’ọhịa mara jijiji,+ tinyere ndị niile na-eche nche; ìgwè ndị agha na-akwakọrọ ihe+ makwara jijiji, ọbụna ha onwe ha, ala malitekwara ịma jijiji,+ o wee ghọọ ịma jijiji si n’aka Chineke.+
6 Ọ bụ Jehova mere ka ndị agha Siria nụ+ ụda ụgbọ agha, ụda ịnyịnya, ụda ìgwè ndị agha,+ nke mere na ha sịrị ibe ha: “Lee! Eze Izrel egowo ndị eze ndị Het+ na ndị eze Ijipt+ ka ha bịa buso anyị agha!”