13 Ọ dịghị odibo nke pụrụ ịbụ ohu nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”+
16 Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?+ N’ihi na anyị bụ ụlọ nsọ+ nke Chineke dị ndụ; dị nnọọ ka Chineke kwuru, sị: “M ga-ebi n’etiti ha,+ na-ejegharịkwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+