2 Ndị Eze 22:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee bịakwute eze ma gwa eze, sị: “Ndị na-ejere gị ozi awụpụtawo ego dị n’ụlọ ahụ, ha na-enye ya ndị na-arụ ọrụ ahụ n’ụlọ Jehova, bụ́ ndị a họpụtara ahọpụta.”+ 2 Ihe E Mere 34:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 N’afọ nke iri na asatọ+ nke ọchịchị ya, mgbe o mesịrị ka ala ahụ na ụlọ ahụ dị ọcha, o ziri Shefan+ nwa Azalaya na Measaya onyeisi obodo na Joa nwa Joahaz onye na-edekọ ihe ka ha gaa rụzie+ ụlọ Jehova bụ́ Chineke ya.
9 Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee bịakwute eze ma gwa eze, sị: “Ndị na-ejere gị ozi awụpụtawo ego dị n’ụlọ ahụ, ha na-enye ya ndị na-arụ ọrụ ahụ n’ụlọ Jehova, bụ́ ndị a họpụtara ahọpụta.”+
8 N’afọ nke iri na asatọ+ nke ọchịchị ya, mgbe o mesịrị ka ala ahụ na ụlọ ahụ dị ọcha, o ziri Shefan+ nwa Azalaya na Measaya onyeisi obodo na Joa nwa Joahaz onye na-edekọ ihe ka ha gaa rụzie+ ụlọ Jehova bụ́ Chineke ya.