32 O mekwara ka ndị niile nọ na Jeruselem nakwa na Benjamin kwado ihe o kwuru. Ndị bi na Jeruselem wee mee dị ka ọgbụgba ndụ ha na Chineke, bụ́ Chineke nna nna ha, si dị.+
2 Ọ bụrụkwa na ị ga-aṅụ iyi,+ sị, ‘Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ n’eziokwu,+ n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume!’+ mba dị iche iche ga-enweta ngọzi n’ime ya, ọ bụkwa ya ka ha ga-eji na-anya isi.”+