7 O debekwara ihe oyiyi a pịrị apị+ nke ogwe osisi dị nsọ o mere n’ụlọ ahụ+ Jehova gwara Devid, gwakwa Sọlọmọn nwa ya banyere ya, sị: “Ọ bụ n’ụlọ a nakwa na Jeruselem, bụ́ ebe m họọrọ n’etiti ebo niile nke Izrel, ka m ga-eme ka aha m dịrị ruo mgbe a na-akaghị aka.+