20 Ma ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, ka ọkụ+ si n’ebe Abimelek nọ pụta rechapụ ndị nwe ala Shikem na ụlọ Milo,+ ka ọkụ+ sikwa n’ebe ndị nwe ala Shikem nọ nakwa n’ụlọ Milo pụta rechapụ Abimelek.”+
10 Ma Ịlaịja zara onyeisi ndị agha iri ise ahụ, sị: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke, ka ọkụ+ si n’eluigwe daa rechapụ gị na ndị agha iri ise gị.” Ọkụ wee si n’eluigwe daa rechapụ ya na ndị agha iri ise ya.+