26“‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru,+ unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, nke unu na ya gbara,+ ka unu gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị iwu banyere ya.+