35 mgbe ha na Jehova gbara ndụ,+ ya enyekwa ha iwu, sị: “Unu atụla egwu chi ọzọ,+ unu akpọrọla ha isiala, unu efekwala ha ofufe, unu achụkwarala ha àjà.+
6 Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche ka unu fee ha ofufe, kpọkwaara ha isiala, ka unu wee ghara iji ọrụ aka unu kpasuo m iwe, ka m wee ghara ime ka ọdachi dakwasị unu.’+