16 Ọ bụ naanị na ọ gaghị eme ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ,+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt iji mee ka ịnyịnya dị ọtụtụ;+ ebe ọ bụ na Jehova agwawo unu, sị, ‘Ya adịla mgbe unu ga-esi n’ụzọ a laghachi azụ ọzọ.’
6 Jehova wee sị Jọshụa: “Atụla egwu n’ihi ha,+ n’ihi na ụdị ugbu a echi, m ga-enyefe ha niile n’aka Izrel ka ha gbuo ha. Ị ga-ese ịnyịnya ha akwara,+ ị ga-esurekwa ụgbọ ịnyịnya ha n’ọkụ.”+