14 “Ma, ònye ka m bụ,+ ole ndị ka ndị m bụkwa, nke na anyị nwere ike inye onyinye afọ ofufo dị otú a?+ N’ihi na ihe niile si n’aka gị,+ ọ bụkwa n’aka gị ka anyị nwetara ihe anyị nyere gị.
5N’ikpeazụ, ọrụ niile Sọlọmọn nwere ịrụ n’ụlọ Jehova gwụchara,+ Sọlọmọn wee malite iwebata ihe ndị Devid nna ya doro nsọ;+ o wee debe ọlaọcha na ọlaedo na arịa niile n’ebe ndebe akụ̀ nke ụlọ ezi Chineke.+