14 Ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọtara onwe ya nwoke obi ya nabatara;+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ịbụ onye ndú+ nke ndị ya, n’ihi na i debeghị ihe Jehova nyere gị n’iwu.”+
12 O wee zie ozi, e wee gaa kpọta ya. Ọ na-acha ọbara ọbara,+ bụrụ nwa okorobịa anya ya mara mma, nke makwara mma ile anya. Jehova wee sị: “Bilie, tee ya mmanụ, n’ihi na ọ bụ onye a!”+