24 “Ma, ka onye na-anya isi nyaa isi na o nwere nghọta+ banyere m, marakwa m, na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye na-egosi obiọma,* na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa;+ n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ,”+ ka Jehova kwuru.
11 “‘Onye ọ bụla n’ime ha agaghịkwa akụziri nwa amaala ibe ya na nwanne ya, sị: “Mara Jehova!”+ N’ihi na ha niile ga-amara m,+ malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha.