10 Ọ bụ ya biliri wee na-egbu ndị Filistia ruo mgbe aka ya na-adịkwaghị ike, aka ya wee jidesie mma agha ya ike,+ Jehova wee zọpụta ha n’ụzọ dị ukwuu n’ụbọchị ahụ;+ ma ndị Izrel so ya laghachi gaa yipụ ndị e gburu egbu ihe ha yi.+
17 O wee sị: “Tụfịakwa!+ Agaghị m eme ihe a, Jehova. M̀ ga-aṅụ ọbara+ ndị ikom ndị tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ gaa seta mmiri?” O kweghị ịṅụ ya.