10 “N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ+ nakwa n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu,+ unu ga-afụ opi maka àjà nsure ọkụ+ unu nakwa àjà udo unu;+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ihe ncheta n’ihu Chineke unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
24 nakwa Shebanaya na Jọshafat na Netanel na Amesaị na Zekaraya na Benaya na Elịiza bụ́ ndị nchụàjà na-afụsi opi ike+ n’ihu igbe ezi Chineke, nakwa Obed-idọm na Jehaya bụ́ ndị na-eche Igbe ahụ nche.